Mark 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.
Mark 7:2 in English
Mark 7:2 · Berean Standard Bible
and they saw some of His disciples eating with hands that were defiled—that is, unwashed.
Context
1Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu, 2ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri. 3Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye. 4Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.