Mak 7:13
Mark 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme.”
Mark 7:13 in English
Mark 7:13 · Berean Standard Bible
Thus you nullify the word of God by the tradition you have handed down. And you do so in many such matters.”
Context
11Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).* 12Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka. 13Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme.” 14Ọzọkwa, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ sị ha, “Geenụ m ntị onye ọbụla, ma ghọtakwanụ nke a. 15Ọ dịghị ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ pụrụ imerụ mmadụ, kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nʼime ya na-apụta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.