Native Bible

Mark 6:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya.

Mark 6:20 in English

Mark 6:20 · Berean Standard Bible

because Herod feared John and protected him, knowing that he was a righteous and holy man. When he heard John’s words, he was greatly perplexed; yet he listened to him gladly.

Context

18Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.” 19Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a, 20nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya. 21Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili. 22Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.