Mak 4:17
Mark 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.*
Mark 4:17 in English
Mark 4:17 · Berean Standard Bible
But they themselves have no root, and they remain for only a season. When trouble or persecution comes because of the word, they quickly fall away.
Context
15Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha. 16Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ. 17Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.* 18Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ; 19ma nchekasị nke ndụ a,* na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.