Mak 15:18
Mark 15:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.”
Mark 15:18 in English
Mark 15:18 · Berean Standard Bible
And they began to salute Him: “Hail, King of the Jews!”
Context
16Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ. 17Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi. 18Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.” 19Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya. 20Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.