Native Bible

Mark 14:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri.

Mark 14:33 in English

Mark 14:33 · Berean Standard Bible

He took with Him Peter, James, and John, and began to be deeply troubled and distressed.

Context

31O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru. 32Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” 33Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. 34Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.” 35Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.