Mak 13:26
Mark 13:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube.
Mark 13:26 in English
Mark 13:26 · Berean Standard Bible
At that time they will see the Son of Man coming in the clouds with great power and glory.*
Context
24“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ,
“ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,
ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya; 25kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada,
ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’* 26“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. 27Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe. 28“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.