Maika 5:2
Micah 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”
Micah 5:2 in English
Micah 5:2 · Berean Standard Bible
But you, Bethlehem Ephrathah, who are small among the clans * of Judah, out of you will come forth for Me One to be ruler over Israel *— One whose origins are of old, from the days of eternity.
Context
1Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha,
nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha.
Ha ga-eji mkpara
tie onyendu Izrel na nti. 2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata,
ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile,
ma onye ahụ ga-achị Izrel
ga-esi na gị pụta,
bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie,
sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” 3Ya mere, a ga-arara ha nye
tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya.
Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ
ga-alọghachikwuru ndị Izrel. 4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya,
site nʼike nke Onyenwe anyị,
na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya.
Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu,
nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.