Native Bible

Matthew 8:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.

Matthew 8:33 in English

Matthew 8:33 · Berean Standard Bible

Those tending the pigs ran off into the town and reported all this, including the account of the demon-possessed men.

Context

31Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.” 32Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. 33Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. 34Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha. 8:5 Obodo dịkarịsịrị nso osimiri Jọdan, nʼakụkụ ndịda ugwu ọnụ mmiri Galili. 8:5 Onye na-achị narị ndị agha 8:17 Aịz 53:4 8:30 Ezi Ezi bụ otu nʼime anụmanụ ndị na-adịghị ọcha nye ndị Juu. Lev 11:7

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.