Matiu 8:18
Matthew 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ.
Matthew 8:18 in English
Matthew 8:18 · Berean Standard Bible
When Jesus saw a large crowd around Him, He gave orders to cross to the other side of the sea.*
Context
16Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. 17Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,
“O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile,
burukwa ọrịa anyị niile.”* 18Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. 19Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” 20Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.