Native Bible

Matthew 5:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe,* ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya,* ‘Onye nzuzu,’* na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.

Matthew 5:22 in English

Matthew 5:22 · Berean Standard Bible

But I tell you that anyone who is angry with his brother * will be subject to judgment. Again, anyone who says to his brother, ‘Raca,’* will be subject to the Sanhedrin.* But anyone who says, ‘You fool!’ will be subject to the fire of hell.*

Context

20Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị. 21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’* 22Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe,* ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya,* ‘Onye nzuzu,’* na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. 23“Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo, 24hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.