Matiu 4:7
Matthew 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’*”
Matthew 4:7 in English
Matthew 4:7 · Berean Standard Bible
Jesus replied, “It is also written: ‘Do not put the Lord your God to the test.’*”
Context
5Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, 6sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị,
“ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,
ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha
ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’*” 7Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’*” 8Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. 9Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.