Native Bible

Matthew 4:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.

Matthew 4:20 in English

Matthew 4:20 · Berean Standard Bible

And at once they left their nets and followed Him.

Context

18Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. 19Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 20Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya. 21Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, 22ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.