Native Bible

Matthew 27:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha.

Matthew 27:53 in English

Matthew 27:53 · Berean Standard Bible

After Jesus’ resurrection, when they had come out of the tombs, they entered the holy city and appeared to many people.

Context

51Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. 54Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!” 55Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.