Native Bible

Matthew 27:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.”

Matthew 27:47 in English

Matthew 27:47 · Berean Standard Bible

When some of those standing there heard this, they said, “He is calling Elijah.”

Context

45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).* 47Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.” 48Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.