Matiu 27:4
Matthew 27:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”
Matthew 27:4 in English
Matthew 27:4 · Berean Standard Bible
“I have sinned by betraying innocent blood,” he said. “What is that to us?” they replied. “You bear the responsibility.”
Context
2Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ. 3Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. 4Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.”
Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” 5Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. 6Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.