Native Bible

Matthew 26:62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?”

Matthew 26:62 in English

Matthew 26:62 · Berean Standard Bible

So the high priest stood up and asked Him, “Have You no answer? What are these men testifying against You?”

Context

60Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara 61kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ. ’ ” 62Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?” 63Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?” 64Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.