Matiu 26:25
Matthew 26:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”
Matthew 26:25 in English
Matthew 26:25 · Berean Standard Bible
Then Judas, who would betray Him, said, “Surely not I, Rabbi?” Jesus answered, “You have said it yourself.”
Context
23Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. 24Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 25Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?”
Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.” 26Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.” 27Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.