Matiu 26:20
Matthew 26:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.
Matthew 26:20 in English
Matthew 26:20 · Berean Standard Bible
When evening came, Jesus was reclining with the twelve disciples.*
Context
18Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ” 19Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ. 20Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. 21Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” 22Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.