Native Bible

Matthew 26:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”

Matthew 26:2 in English

Matthew 26:2 · Berean Standard Bible

“You know that the Passover is two days away, and the Son of Man will be handed over to be crucified.”

Context

1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, 2“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.” 3Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas. 4Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.