Matiu 23:35
Matthew 23:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.
Matthew 23:35 in English
Matthew 23:35 · Berean Standard Bible
And so upon you will come all the righteous blood shed on earth, from the blood of righteous Abel to the blood of Zechariah son of Berechiah, whom you murdered between the temple and the altar.
Context
33“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? 34Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ. 35Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu. 36Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a. 37“O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.