Native Bible

Matthew 23:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.

Matthew 23:11 in English

Matthew 23:11 · Berean Standard Bible

The greatest among you shall be your servant.

Context

9Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe. 10Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst. 11Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 12Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.” 13“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.