Native Bible

Matthew 22:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?”

Matthew 22:28 in English

Matthew 22:28 · Berean Standard Bible

In the resurrection, then, whose wife will she be of the seven? For all of them were married to her.”

Context

26Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa. 27Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 28Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?” 29Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. 30Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.