Matiu 20:25
Matthew 20:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe,* ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha.
Matthew 20:25 in English
Matthew 20:25 · Berean Standard Bible
But Jesus called them aside and said, “You know that the rulers of the Gentiles lord it over them, and their superiors exercise authority over them.
Context
23Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.” 24Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a. 25Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe,* ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 26Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi. 27Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.