Matiu 2:5
Matthew 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,
Matthew 2:5 in English
Matthew 2:5 · Berean Standard Bible
“In Bethlehem in Judea,” they replied, “for this is what the prophet has written:
Context
3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst* ahụ. 5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda,
ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda,
nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta,
onye ga-achị ndị nke m Izrel.’*” 7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.