Native Bible

Matthew 19:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe.

Matthew 19:23 in English

Matthew 19:23 · Berean Standard Bible

Then Jesus said to His disciples, “Truly I tell you, it is hard for a rich man to enter the kingdom of heaven.

Context

21Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” 22Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. 23Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. 24Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 25Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.