Matiu 18:7
Matthew 18:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa.
Matthew 18:7 in English
Matthew 18:7 · Berean Standard Bible
Woe to the world for the causes of sin. These stumbling blocks must come, but woe to the man through whom they come!
Context
5Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m. 6“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya. 7Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa. 8Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. 9Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.