Native Bible

Matthew 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu.

Matthew 17:3 in English

Matthew 17:3 · Berean Standard Bible

Suddenly Moses and Elijah appeared before them, talking with Jesus.

Context

1Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. 2Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè. 3Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu. 4Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.” 5Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.