Matiu 17:26
Matthew 17:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ.
Matthew 17:26 in English
Matthew 17:26 · Berean Standard Bible
“From others,” Peter answered. “Then the sons are exempt,” Jesus declared.
Context
24Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ* bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?” 25Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.”
Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?” 26Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.”
Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. 27Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
17:21 Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Mak 9:29.
17:24 Didrakma abụọ bụ ọnụ ego ụtụ ụlọnsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.