Matiu 15:20
Matthew 15:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.”
Matthew 15:20 in English
Matthew 15:20 · Berean Standard Bible
These are what defile a man, but eating with unwashed hands does not defile him.”
Context
18Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. 19Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu. 20Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.” 21Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn. 22Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.