Matiu 14:21
Matthew 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.
Matthew 14:21 in English
Matthew 14:21 · Berean Standard Bible
About five thousand men were fed, in addition to women and children.
Context
19Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. 21Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị. 22Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. 23Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.