Matiu 12:17
Matthew 12:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru,
Matthew 12:17 in English
Matthew 12:17 · Berean Standard Bible
This was to fulfill what was spoken through the prophet Isaiah:
Context
15Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile. 16Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ. 17Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru, 18“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara.
Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ.
Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya.
Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. 19Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike.
O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.