Native Bible

Matthew 11:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha.* Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye.

Matthew 11:5 in English

Matthew 11:5 · Berean Standard Bible

The blind receive sight, the lame walk, the lepers * are cleansed, the deaf hear, the dead are raised, and the good news is preached to the poor.

Context

3Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?” 4Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ. 5Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha.* Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye. 6Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 7Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.