Native Bible

Matthew 10:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè.

Matthew 10:26 in English

Matthew 10:26 · Berean Standard Bible

So do not be afraid of them. For there is nothing concealed that will not be disclosed, and nothing hidden that will not be made known.

Context

24“Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu. 25O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a? 26“Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè. 27Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya. 28Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.