Malakaị 3:11
Malachi 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
Malachi 3:11 in English
Malachi 3:11 · Berean Standard Bible
I will rebuke the devourer * for you, so that it will not destroy the fruits of your land, and the vine in your field will not fail to produce fruit,” says the LORD of Hosts.
Context
9Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi. 10Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m,” ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 11“Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 12“Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 13Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.”
“Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.