Malakaị 2:7
Malachi 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Malachi 2:7 in English
Malachi 2:7 · Berean Standard Bible
For the lips of a priest should preserve knowledge, and people should seek instruction from his mouth, because he is the messenger of the LORD of Hosts.
Context
5“Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu. 6Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa. 7“Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 8Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 9“Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.