Malakaị 2:17
Malachi 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị. Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?” Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?” 2:3 Maọbụ, kpọnwụsịa mkpụrụ ọghịgha unu
Malachi 2:17 in English
Malachi 2:17 · Berean Standard Bible
You have wearied the LORD with your words; yet you ask, “How have we wearied Him?” By saying, “All who do evil are good in the sight of the LORD, and in them He delights,” or, “Where is the God of justice?”
Context
15Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ. 16“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. 17Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị.
Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?”
Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”
2:3 Maọbụ, kpọnwụsịa mkpụrụ ọghịgha unu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.