Malakaị 2:12
Malachi 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.
Malachi 2:12 in English
Malachi 2:12 · Berean Standard Bible
As for the man who does this, may the LORD cut off from the tents of Jacob everyone who is awake and aware—even if he brings an offering to the LORD of Hosts.
Context
10Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị? 11Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ. 12Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye. 13Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha. 14Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.