Luk 9:46
Luke 9:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu.
Luke 9:46 in English
Luke 9:46 · Berean Standard Bible
Then an argument started among the disciples as to which of them would be the greatest.
Context
44(43) Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, (44) “Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.” 45Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara. 46Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu. 47Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya. 48Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.