Luk 8:26
Luke 8:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin,* nke dị nʼofe mmiri Galili.
Luke 8:26 in English
Luke 8:26 · Berean Standard Bible
Then they sailed to the region of the Gerasenes,* across the lake from Galilee.
Context
24Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!”
O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. 25Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?”
Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.” 26Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin,* nke dị nʼofe mmiri Galili. 27Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu. 28Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.