Luk 4:20
Luke 4:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya.
Luke 4:20 in English
Luke 4:20 · Berean Standard Bible
Then He rolled up the scroll, returned it to the attendant, and sat down. The eyes of everyone in the synagogue were fixed on Him,
Context
18“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na o teela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ,
ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì,
ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. 19Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.”* 20O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. 21Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” 22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.