Native Bible

Luke 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.

Luke 3:8 in English

Luke 3:8 · Berean Standard Bible

Produce fruit, then, in keeping with repentance. And do not begin to say to yourselves, ‘We have Abraham as our father.’ For I tell you that out of these stones God can raise up children for Abraham.

Context

6Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”* 7Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 9Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.” 10Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.