Native Bible

Luke 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?

Luke 23:6 in English

Luke 23:6 · Berean Standard Bible

When Pilate heard this, he asked if the man was a Galilean.

Context

4Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.” 5Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.” 6Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili? 7Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ. 8Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.