Luk 22:13
Luke 22:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ.
Luke 22:13 in English
Luke 22:13 · Berean Standard Bible
So they went and found it just as Jesus had told them. And they prepared the Passover.
Context
11Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’ 12Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.” 13Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ. 14Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe. 15Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.