Luk 2:16
Luke 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.
Luke 2:16 in English
Luke 2:16 · Berean Standard Bible
So they hurried off and found Mary and Joseph and the Baby, who was lying in the manger.
Context
14“Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe.
Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.” 15Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.” 16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri. 17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a. 18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.