Luk 18:14
Luke 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
Luke 18:14 in English
Luke 18:14 · Berean Standard Bible
I tell you, this man, rather than the Pharisee, went home justified. For everyone who exalts himself will be humbled, but the one who humbles himself will be exalted.”
Context
12Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ 13“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’ 14“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.” 15Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba. 16Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.