Luk 12:15
Luke 12:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.”
Luke 12:15 in English
Luke 12:15 · Berean Standard Bible
And He said to them, “Watch out! Guard yourselves against every form of greed, for one’s life does not consist in the abundance of his possessions.”
Context
13Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.” 14Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?” 15Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.” 16Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu. 17O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.