Levitikọs 9:20
Leviticus 9:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja.
Leviticus 9:20 in English
Leviticus 9:20 · Berean Standard Bible
and placed these on the breasts. Aaron burned the fat portions on the altar,
Context
18Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja. 19Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha, 20tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. 21Mgbe ahụ, Erọn fufere, dịka onyinye mfufe, obi anụ ahụ, na apata aka nri ha nʼihu Onyenwe anyị dịka Mosis nyere nʼiwu. 22Erọn weliri aka ya elu nʼebe ụmụ Izrel nọ, gọzie ha. Emesịa, mgbe ọ chụchara aja mmehie, na aja nsure ọkụ na aja udo, o sitere nʼebe ịchụ aja ahụ rịdata.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.