Levitikọs 8:26
Leviticus 8:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ.
Leviticus 8:26 in English
Leviticus 8:26 · Berean Standard Bible
And from the basket of unleavened bread that was before the LORD, he took one cake of unleavened bread, one cake of bread made with oil, and one wafer, and he placed them on the fat portions and on the right thigh.
Context
24Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ. 25O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya 26O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ. 27O tinyere ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ha fufere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. 28Mosis naara ya site nʼaka ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ya na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ aja ido nsọ nke isisi ya dị ezi mma, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.