Native Bible

Leviticus 8:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.

Leviticus 8:22 in English

Leviticus 8:22 · Berean Standard Bible

After that, Moses presented the other ram, the ram of ordination, and Aaron and his sons laid their hands on its head.

Context

20Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ. 21Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 22O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya. 23Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 24Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.